LYRICS: Phyno – Ochie Dike Mama ft. Onyeka Onwenu

0

Read Full lyrics Of Ochie Dike Mama By Phyno ft. Onyeka Onwenu

[Verse 1 – Phyno]
Nnem Nneoma
Okwa gi n’edu’m ka mmuo
Isim atul’ujo, nwa jee nke oma
Man’ekpelum ekpere kam no oma
He! Onwelu ife ikwelu k’okom
Inwelugodi ije yoolum
I nwe mama letekwa nne gi oh

[Hook/Chorus – Onyeka Onwenu]
Chukwu biko gozie, Ochie Dike Mama
Nna gozie Nnem, Ochie Dike Nnem
Chukwu biko gozie “daalu Nnem”,
Ochie Dike Mama “daalu nnem oh”
Nna gozie Nnem “Chukwu gozie gi”
Ochie Dike Nnem “Ochie Dike Nnem oh”

[Verse 2 – Phyno]
Ahnn, Olisah gozielum nwanyi
ahu m’si n’ime ya puta uwa
Maka afufu n’ile ota’alum n’elu uwa
Okwa ekpele gi n’edu’m ije n’elu uwa
Si’m welu obi ume ala sobe ndi uwa
Zuom n’uzo Chi, si’m hapu ihe nke uwa
Si’m solu obim, esokwala ndi uwa
Ebe obula osolum noro n’elu uwa
Iga anom na-aru k’ibu oburu puta uwa
“Hmn hmnn hmnn hmmmmnn”
Ina ebuzo agum before igunye onwe gi
Mgbe ozulum I hapurum oke gi
Mgbe umu uwa biara ka ha megidem
“Hmn hmnn hmnn hmmmmnn”
Isi’m akujola my face e ndu nwoke
Lee lee, okwa o gbajie dolo
“Hmn hmnn hmnn hmmmmnn”
Ikwu n’ibe gbarapum, gi ka m’na agbakuru
Obu gini ka m’ga eji ekele Mama’m
Chineke Nna biko gozielum Mama’m

[Pre Hook/Chorus – Onyeka Onwenu]
I mana onwa-ite naani oh,
ka nnem bulum n’afo
Nnem tala afufu n’uwa
wee muo’m ezigbo nnem
O bu gini ka m’ga eji,
wee kele nne mulum oh
Ochie Dike Nnem
Obu ego, obu akwa ojiro
Agam ayonu yonu yonu onye kelum oh
“Chineke Nnam”
Biko gozielum nnem oh “gozie gozie”
Ochie Dike Nnem “oh nnem oh”

[Hook/Chorus – Onyeka Onwenu]
Chukwu biko gozie, Ochie Dike Mama
Nna gozie nnem, Ochie Dike nnem
Chukwu biko gozie, Ochie Dike Mama
Nna gozie nnem, Ochie Dike Nnem

Share
Share.

About Author

Leave A Reply